Acts 10:38 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ana m echekwa na unu nile maara ihe banyere Jisọs onye Nazaret, Onye Chineke mejupụtara nꞌike Mmụọ Nsọ. O jegharịrị nꞌebe nile dị iche iche na-arụ ọrụ ebere, chụpụkwa mmụọ ọjọọ, nꞌihi na Chineke nọnyeere ya.
Igbo 2006
bú Jisus Nke si na Nazaret puta, otú Chineke were Mọ Nsọ na ike te Ya dika manu-otite: Onye jeghariri nālu ọlu ọma, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi nile ekwensu mere ha dika onye-nwe-ha; n'ihi na Chineke soro Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu Chineke si were Mmụọ Nsọ na ike wụkwasị Jisọs onye Nazaret dịka mmanụ, na otu o si jegharịa na-eme mma na-agwọkwa ndị niile ekwensu na-emekpa ahụ, nʼihi na Chineke nọnyeere ya.