Acts 10:39 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Anyị onwe anyị bụkwa ndị akaebe ihe ndị a nile. Anyị hụzukwara ọrụ nile ọ rụrụ nꞌala Izirel nile na nꞌime Jerusalem ebe a nọ kpọgide ya nꞌelu obe.
Igbo 2006
Ayi onwe-ayi bu kwa ndi-àmà nke ihe nile O mere n'ala ndi-Ju, na nime Jerusalem; Onye ha b͕u-kwa-ra, nākwuba Ya n'elu osisi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Anyị bụ ndị akaebe ihe niile o mere nʼala ndị Juu na nʼime Jerusalem. Ha gburu ya site nʼịkpọgide ya nʼelu obe.