Acts 10:41 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Kama ọ bụghị mmadụ nile hụrụ ya. Ọ bụ anyị ndị Chineke họpụtara hụrụ ya. Anyị sokwa ya rikọọ nri, sorokwa ya ṅụkọọkwa ihe ọṅụṅụ mgbe o si nꞌọnwụ bilie.
Igbo 2006
Ọ bughi ndi-Ju nile ka egosiri Ya, kama ọ bu ndi-àmà Chineke buru uzọ rọputa, bú ayi onwe-ayi, ndi soro Ya nēri nāṅu kwa mb͕e O siri na ndi nwuru anwu bilie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụghị mmadụ niile kama ọ bụ naanị anyị ndị Chineke họpụtara, dịka ndị akaebe, ndị soro ya rie ma ṅụọkwa mgbe o si nʼọnwụ bilie.