Acts 11:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị kwere ekwe ahụ nile sitere Jerusalem gbapụ nꞌoge ahụ mkpagbu ahụ bidoro, mgbe a tụgburu Stivin na nkume, gara nꞌihu na-agbasa ozi ọma. Ụfọdụ ha gara Fonisia na Saiprọs na Antiọk. Ma ọ bụ nanị ndị Juu ka ha na-ekwusara ozi ọma ahụ.
Igbo 2006
Ya mere ndi b͕asara site na nkpab͕u nke putara n'ihi Stifen jeruru Finisia, na Saiprọs, na Antiọk, ha adighi-agwa onye ọ bula okwu Chineke ma-ọbughi nání ndi-Ju.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, ndị ahụ niile gbasasịrị nʼihi mkpagbu ahụ bidoro mgbe a tụgburu Stivin na nkume, jeruru akụkụ Fonisia na Saiprọs na Antiọk na-ekwusa oziọma ahụ naanị nʼetiti ndị Juu.