Acts 11:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Otu ọ dị, ụfọdụ zisakwaara ndị Griik ozi ọma. Ụfọdụ ndị a sitere nꞌobodo Saiprọs na Sirini gaa nꞌobodo a na-akpọ Antiọk kwusaa ozi ọma Onyenwe anyị Jisọs.
Igbo 2006
Ma ufọdu di n'etiti ha, ndikom nke Saiprọs na Sairini, ndi, mb͕e ha biaruru Antiọk, ha gwa kwa ndi-Grik okwu ahu, nēzisa ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma otu ọ dị, ụfọdụ nʼime ndị ikom ndị ahụ sitere nʼakụkụ Saiprọs na Sirini gara Antiọk, malite ikwusara ndị Griik oziọma banyere Onyenwe anyị Jisọs.