Acts 11:26 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
mb͕e ọ chọtara ya, o we kuru ya bia Antiọk. O we rue, na ọbuná ogologo otù arọ ha zukọrọ na nzukọ Kraist, zí kwa oké ìgwè madu ihe; na ọ bu kwa n'Antiọk ka eburu uzọ kpọ ndi nēso uzọ Jisus ndi-Kristian.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ chọpụtara ya, o duuru ya bịa nʼAntiọk. Ihe ha ka otu afọ, ka ha na-ezukọ nʼụlọ chọọchị na-akụziri ọtụtụ igwe mmadụ ihe. Ọ bụ nʼime Antiọk ka e buru ụzọ kpọọ ndị na-eso ụzọ ya ndị Kraịst.