Acts 11:28 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Otu nwoke nꞌime ha a na-akpọ Agabus biliri ọtọ nꞌetiti nzukọ ahụ buo amụma site nꞌike Mmụọ Nsọ banyere oke ụnwụ ahụ ga-abịakwasị ụwa nile. Amụma a mezukwara nꞌoge Kladiọs chịrị dị ka eze ndị Rom nile.
Igbo 2006
Ma otù onye nime ha, aha-ya bu Agabọs, biliri, we gosi site na Mọ Nsọ na oké unwu gaje ida n'elu-uwa dum madu bi: nke putara n'oge Klọdiọs.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu onye nʼime ha a na-akpọ Agabọs biliri ọtọ buo amụma site nʼike Mmụọ Nsọ banyere oke ụnwụ ga-abịakwasị ụwa niile. Amụma a mezukwara nʼoge Klọdiọs na-achị.