Acts 11:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ gwara ha sị, “Otu ụbọchị, mgbe m nọ nꞌobodo Jopa, ahụrụ m ọhụ nꞌoge m na-ekpe ekpere. Nꞌime ọhụ a, ahụrụ m ihe yiri efere buru ibu. E budatara ya nꞌihu m. Efere a nwekwara ụkwụ igwe anọ. E sitekwara nꞌeluigwe zidata ya.
Igbo 2006
Mu onwem nọ n'obodo Jọpa nēkpere: m'we hu ọhù nime inyoghi, otù ihe ka ọ nārida, dika oké ákwà ọcha nke anēsi n'elu-igwe were nkuku anọ eweda n'ala; o we bia rue ọbuná n'ebe m'nọ:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Otu ụbọchị, mgbe m nọ nʼobodo Jopa, ahụrụ m ọhụ nʼoge m na-ekpe ekpere. Nʼime ọhụ a, ahụrụ m ihe yiri akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata site nʼeluigwe. E budatara ya nʼihu m.