Acts 12:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ha pụtara site nꞌime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ dịghị anya, ha bịaruru nꞌogige e ji igwe wuo. Ụzọ dị nꞌebe ahụ meghekwara nꞌonwe ya. Mmụọ ozi ahụ jidekwara Pita nꞌaka tutuu ruo mgbe ha gafesịrị ọnụ ụzọ nile nke ụlọ mkpọrọ ahụ. Mgbe ha pụtara nꞌezi, mmụọ ozi ahụ hapụrụ Pita aka. Pita ahụkwaghị ya anya ọzọ.
Igbo 2006
Ma mb͕e ha gasiri ndi-nche mbu na ndi-nche nke-abua, ha biaruru ọnu-uzọ-ama ígwè ahu nke esi abà nime obodo; nke meghere onwe-ya nye ha: ha we pua, gabiga n'otù uzọ ntà; ngwa ngwa mọ-ozi ahu we pua n'ebe ọ nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha gafere ndị nche nke mbụ na nke abụọ rute nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime obodo, nke bụ ọnụ ụzọ igwe. Ọnụ ụzọ igwe ahụ meghekwara nʼonwe ya, ha esite na ya gafee. Mgbe ha gara ije ruo ebe tere anya nʼama nke ọzọ, ngwangwa mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya.