Acts 12:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ kwa ka Pita ghọtara ihe nile mere. O kwuru sị, “Nꞌezie, Onyenwe anyị ezitela mmụọ ozi ya ka ọ bịa napụta m site nꞌaka eze Herọd. Ugbu a ọ napụtakwala m site nꞌọchịchọ ọjọọ nile nke ndị Juu.”
Igbo 2006
Mb͕e Pita mara onwe-ya, ọ si, Ub͕u a ka m'matara n'ezie, na Onye-nwe-ayi ziputara mọ-ozi-Ya, weputam n'aka Herod, ya na ile-anya nile nke ndi-Ju.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ kwa ka Pita ghọtara ihe niile mere. O kwuru, “Ugbu a, amatala m nʼezie, na Onyenwe anyị ezitela mmụọ ozi ya, ka ọ bịa zọpụta m site nʼaka eze Herọd na ihe niile ndị Juu na-atụ anya ya. Ugbu a ọ napụtakwala m site nʼọchịchọ ọjọọ niile nke ndị Juu.”