Acts 12:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Herọd nọ na Sizaria, ndị obodo Taịa na Saidọn zipụrụ ndị ozi ha izute ya nꞌihi na Herọd na-eweso ha iwe. Ma ndị ozi a buru ụzọ mee ka ha na Blastọs ode akwụkwọ eze bụrụ enyi. Ha rịọrọ ya ka o mee ka udo dịrị. Nꞌihi na ndị obodo ahụ na-esite nꞌobodo nke Herọd na-achị na-enweta ihe oriri ha.
Igbo 2006
Ma Herod nēbu agha nke-uku megide Taia na Saidon n'obi-ya: ha we were otù obi biakute ya; mb͕e ha mesiri Blastọs eyì-ha, nke bu onye nēle ime-ulo-ndina nke eze anya, ha we riọ ka udo di n'etiti ha, n'ihi na esi n'ala nke eze ahu azù ala-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge ahụ Herọd na-eweso ndị Taịa na Saịdọn iwe, ha zipụrụ ndị ozi ha izute ya. Ha buru ụzọ mee ka ha na Blastọs bụrụ enyi, onye eze tụkwasịrị obi nke na-elekọtakwa ime ụlọ ndina eze anya. Ha rịọrọ ya ka udo dịrị, nʼihi na a na-esi nʼobodo eze na-enwetara ha ihe oriri.