Acts 12:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
tụba ya nꞌụlọ mkpọrọ, O zipụrụ ndị agha iri na isii ka ha chee ya nche. Ihe Herọd bu nꞌobi bụ ka o nyefee Pita nꞌaka ndị Juu, ka ha gbuo ya mgbe mmemme ngabiga gafere.
Igbo 2006
Mb͕e o jidesiri ya, ọ tubà ya n'ulo-nkpọrọ, we rara ya nye n'aka ndi-agha iri na isi iche ya anọ anọ; nēzube ikuputa ya nye ndi-Ju mb͕e ememe ngabiga gasiri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe o jidere ya, o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ ebe o mere ka ndị agha chee ya nche, ndị agha anọ nʼotu oge, ndị agha anọ ọzọ nʼoge nke ọzọ. Ebumnobi ya bụ ịkpọpụta ya nʼihu ọha mmadụ kpee ya ikpe mgbe Mmemme Ngabiga gasịrị.