Acts 12:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Na mberede, ìhè dị ukwuu nwụrụ nꞌime ụlọ mkpọrọ ahụ. Mmụọ ozi batara guzo nꞌakụkụ Pita metụ ya aka. Pita tetara nꞌụra. Ọ nụrụ ka mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Pita! Bilie ngwangwa!” Nꞌotu oge ahụ, eriri igwe ahụ dapụrụ nꞌala.
Igbo 2006
Ma le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi guzoro ya nso, ìhè nwu-kwa-ra n'ime-ulo nke ulo-nkpọrọ: o we tie Pita aka n'akuku, kpote ya, si, Bilie ọsọsọ. Nkpọrọ-ya abua we dapu n'aka-ya abua.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Na mberede mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara guzoro nʼebe ahụ, ìhè nwukwara nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ kutụrụ Pita aka nʼakụkụ sị, “Ngwangwa, bilie ọtọ!” Eriri igwe ahụ dapụrụ nʼaka ya.