Acts 12:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Pita sooro mmụọ ozi ahụ nꞌazụ site nꞌụlọ mkpọrọ ahụ pụta. Ma Pita chere na ihe ndị a na-eme na nrọ, ma ọ bụ na ọ bụ ọhụ ka ọ na-ahụ. O kwenyeghị na ihe ndị a nile pụrụ imezu. O jukwara ya anya nke ukwuu.
Igbo 2006
O we pua, so ya; ma ọ mataghi na ọ bu ezie, bú ihe emere site n'aka mọ-ozi, kama ọ nēchè na ọ nāhu ọhù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Pita sooro ya nʼazụ, o chere na ọ na-ahụ ọhụ, ma ọ mataghị na ihe mmụọ ozi ahụ na-eme bụ ezie.