Acts 13:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị amụma na ndị nkuzi ụfọdụ nọkwa na nzukọ Kraịst dị nꞌAntiọk. Ụfọdụ nꞌime ha bụ Banabas na Simiọn onye a na-akpọ Nwoke ojii, na Lusiọs onye Sirini, na Menien onye sitere nꞌezinụlọ Herọd pụta, na Sọl.
Igbo 2006
Ma ndi-amuma na ndi-ozizí di n'Antiọk, nime nzukọ Kraist di n'ebe ahu, bú Banabas, na Simeon onye anākpọ Naiga, na Lusiọs onye Sairini, na Manaen onye azùkọrọ ya na Herod, bú tetrarch, na Sọl.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị amụma na ndị nkuzi ụfọdụ nọkwa na nzukọ dị nʼAntiọk. Ụfọdụ nʼime ha bụ Banabas na Simiọn onye a na-akpọ nwoke ojii, na Lusiọs onye Sirini, na Manaen (onye azụlitekọrọ ya na eze Herọd), na Sọl.