Acts 13:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi ya lee, aka Chineke na-adakwasị gị ugbu a. Ọ ga-emekwa ka ị baa nꞌikpe na ahụhụ. Ya mere, malite ugbu a, ị ga-abụ onye kpụrụ ìsì! Ị gaghị ahụkwa ìhè anya ụbọchị ụfọdụ!” Nꞌotu oge ahụ, nwoke a kpuru ìsì. Ọ malitekwara ijegharị nꞌime ọchịchịrị, na-achọkwa onye ga na-edugharị ya.
Igbo 2006
Ub͕u a, le, aka Onye-nwe-ayi di kwa n'aru gi, i gēkpu kwa ìsì, nāhughi anyanwu nwa oge. Ngwa ngwa alulu na ọchichiri dakwasiri ya; o we nējeghari nāchọ ndi gējide ya n'aka idu ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi ya lee, iwe nke Onyenwe anyị ga-adakwasị gị. Ị ga-ekpụ ìsì nwa oge, ị gaghị enwe ike hụ ìhè nke anyanwụ.” Nʼotu oge ahụ, ọ hụkwaghị ụzọ ọzọ. Ọ malitere na-ebigharị aka, na-achọkwa onye ga na-edugharị ya.