Acts 13:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe a gụpụtasịrị site nꞌakwụkwọ Mosisi na nke ndị amụma ndị isi ụlọ nzukọ ahụ gwara Pọl na Banabas okwu sị, “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu ndụmọdụ unu chọrọ inye anyị, bịanụ ka unu gwa anyị ya.”
Igbo 2006
Ma mb͕e agusiri akwukwọ iwu na ndi-amuma, ndi-isi ulo-nzukọ ahu zigara ha ozi, si, Umu-nne-ayi, ọ buru na unu nwere okwu nkasi-obi igwa ndi-ayi, kwuenu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe a gụpụtasịrị site nʼakwụkwọ iwu na nke ndị amụma, ndịisi ụlọ ekpere ahụ zigara ya ozi, sị, “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu ịgbaume nye anyị, biko kwuonụ ya.”