Acts 13:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Chineke nke Izirel họpụtara nna nna anyị ha mee ha mba dị ukwuu nꞌoge ha nọ nꞌobodo Ijipti. Chineke sitere nꞌike ya dị ukwuu gbapụta ha site nꞌọnọdụ ịbụ ohu ha.
Igbo 2006
Chineke nke ndi nka, bú Israel, rọputara nna-ayi-hà, we welie ndi Israel elu mb͕e ha nọ dika ọbìa n'ala Ijipt, O were kwa ogwe-aka di elu duputa ha nime ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Chineke nke Izrel họpụtara nna nna anyị ha mee ha mba dị ukwu nʼoge ha nọ nʼobodo Ijipt. O ji ike aka ya dupụta ha site nʼala ahụ.