Acts 13:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Otu mgbe, ndị a zukọrọ ibu ọnụ na ikpe ekpere. Mmụọ Nsọ gwara ha okwu sị, “Kewapụnụ Banabas na Sọl ka ha nọdụ iche. Nꞌihi na enwere m ọrụ dị ukwuu ha ga-arụ nꞌaha m.”
Igbo 2006
Ma mb͕e ha nēfè Onye-nwe-ayi òfùfè, nēbu kwa ọnu, Mọ Nsọ siri, Kewaputaram Banabas na Sọl ilu ọlu nke M'kpọworo ha ka ha lua.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha nọ na-efe Onyenwe anyị ofufe na-ebukwa ọnụ, Mmụọ Nsọ sịrị, “Kewapụtaranụ m Banabas na Sọl, nʼihi ọrụ ahụ nke m kpọrọ ha.”