Acts 13:22 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Chineke wepụrụ Sọl, họpụta Devidi ka ọ bụrụ eze nꞌọnọdụ ya. Chineke kwuru okwu banyere Devidi sị, ‘Devidi nwa Jeesi bụ nwoke a họpụtara site nꞌọchịchọ obi m. Ọ bụkwa onye na-eme ihe nile m chọrọ ka o mee mgbe nile.’
Igbo 2006
Mb͕e O wepusiri ya, O welie Devid ibu eze-ha; onye Ọ b͕a-kwa-ra àmà, si, Achọtawom Devid nwa Jesi, nwoke nke di ka obim si achọ, onye gēme ihe nile M'nāchọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe o wepụsịrị ya, o mere Devid ka ọ bụrụ eze ha. Ọ gbara ama banyere ya sị, ‘Achọtala m Devid nwa Jesi, nwoke nke dị ka ọchịchọ obi m nke si dị. Ọ bụkwa onye ga-eme ihe niile m chọrọ ka o mee.’