Acts 13:27 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị Juu bi na Jerusalem na ndị isi ha amataghị na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ. Ha aghọtakwaghị okwu nile ndị amụma dere, okwu nke a na-agụpụta na ntị ha kwa izu. Ma ha mere ka okwu ahụ ndị amụma kwuru mezuo, mgbe ha mara Jisọs ikpe ọnwụ.
Igbo 2006
N'ihi na ndi bi na Jerusalem, na ndi-isi-ha, ebe ha nāmataghi Ya, na olu ndi-amuma nke anāgu n'ubọchi-izu-ike nile, ha mezuru ha n'ima Ya ikpé.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị bi na Jerusalem na ndị na-achị ha amataghị ya, nke ha ji aghọta okwu ndị amụma nke a na-agụpụtara ha kwa izu, bụ nʼụbọchị izuike. Ma ha mere ka okwu ahụ mezuo, mgbe ha mara ya ikpe ọnwụ.