Acts 13:31 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
E mekwara ka ọtụtụ mmadụ hụ ya anya ọtụtụ mgbe nꞌime ụbọchị ụfọdụ. Ndị nile soro ya jegharịa hụkwara ya, bụ ndị ahụ soro ya jegharịa site na Galili ruo Jerusalem. Ndị a bụkwa ndị na-agba ama nꞌihu ọtụtụ mmadụ banyere ihe ndị a.
Igbo 2006
ewe me ka ha hu Ya ọtutu ubọchi, bú ndi soro Ya si na Galili rigoro Jerusalem, ndi buru ndi-Ju ndi-àmà-Ya ub͕u a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị niile soro ya jegharịa site na Galili ruo Jerusalem hụkwara ya anya ọtụtụ ụbọchị. Ndị a bụkwa ndị na-agba ama nʼihu ndị mmadụ banyere ya.