Acts 13:34 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Chineke kwererị nkwa ime ka Jisọs site nꞌọnwụ bilie. Ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Nke a bụ ihe akwụkwọ nsọ na-agwa anyị mgbe e kwuru nꞌime ya sị, ‘Aga m emezuru gị nkwa ahụ nile m kwere Devidi.’
Igbo 2006
Ma na O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ọ dighi na Ọ gaje ilaghachi n'ire-uré ọzọ, O kwuwo otú a, si, M'gēnye unu ihe nile di ọcha nke kwesiri ntukwasi-obi nke ekwere Devid na nkwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma banyere ime ka o site nʼọnwụ bilie, ka ọ ghara ịlaghachi nʼire ure ọzọ. Nke a bụ ihe o kwuru, “ ‘Aga m emezuru gị nkwa nsọ ahụ niile m kwere Devid.’