Acts 13:46 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Pọl na Banabas jiri olu ike na-ekwu okwu Onyenwe anyị. Ha na-ekwukwa sị, “Ọ dị mkpa na ozi ọma a ga-ebu ụzọ rute ndị Juu. Ma dị ka unu siri jụ ịnabata ya nke ọma, unu na-egosi na unu ekwesịghị ịnata ndụ ebighị ebi nke Chineke na-enye unu. Ugbu a, anyị ga-ewerekwa ozi ọma ahụ jekwuru ndị mba ọzọ.
Igbo 2006
Pọl na Banabas we kwuwa okwu, si, Ọ di nkpà ka eburu uzọ gwa unu okwu Chineke. Ebe unu nēnupu ya n'aru-unu, nekpe kwa onwe-unu ndi nēkwesighi ndu ebighi-ebi, le, ayi gaje ichighari gwa ndi mba ọzọ okwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Pọl na Banabas kwuru okwu na-asọghị anya sị, “Ọ dị mkpa na anyị buuru ụzọ gwa unu okwu nke Chineke, ma ebe ọ bụ na unu jụrụ ịnabata ya, na-echekwa na unu ekwesighị inweta ndụ ebighị ebi, lee, anyị ga-agakwuru ndị mba ọzọ.