Acts 13:50 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ ndị isi Juu ahụ kpalịrị obi ọtụtụ ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke tinyere ndị isi obodo ahụ. Ha sitere nꞌọgbakọ ọjọọ ndị a megide Pọl na Banabas, chụpụ ha site nꞌobodo ahụ.
Igbo 2006
Ma ndi-Ju kwaliri ndinyom nātu egwu Chineke, bú ndi anāsọpuru, na ndi-isi obodo ahu, ha we kpalie nsob͕u megide Pọl na Banabas, we chupu ha n'ókè-ala-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ndị Juu kpaliri obi ọtụtụ ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke ndị ọnọdụ ha dị elu, na ndị ikom ndị nke ndu obodo ahụ. Ha kpasuru mkpagbu megide Pọl na Banabas si otu a, chụpụ ha site nʼobodo ahụ.