Acts 13:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma Bajisọs onye mgbaasị ahụ, onye aha ọzọ a na-akpọ ya nꞌasụsụ Griik bụ Elimas, malitere inye ọtụtụ nsogbu, ime ka ọchịagha ahụ hapụ ịghọta ihe Banabas na Sọl na-agwa ya. Ọ chọkwaghị ka ọchịagha ahụ chegharịa kwere nꞌOnyenwe anyị Jisọs.
Igbo 2006
Ma Elimas, bú onye-mb͕asi ahu, (n'ihi na otú a ka aha-ya di ma asugharia ya), nēguzogide ha, nāchọ uzọ iduhie onye-isi ahu n'okwukwe-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma onye mgbaasị ahụ, onye aha ya bụkwa Elimas (nʼihi nke a bụ aha ya ma asụgharịa ya) malitere igbochi ha site nʼimegharị onyeisi ahụ anya ka ọ ghara ịnabata okwukwe ahụ.