Acts 14:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ, onye nchụaja Jupita, bụ chi nwere ụlọ nchụaja nꞌihu obodo ahụ, bupụtara igbe okoko osisi dị iche iche. Ọ kwadokwara iji chi ịchụ aja nye Pọl na Banabas nꞌọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ, nꞌihu igwe mmadụ ahụ.
Igbo 2006
Onye-nchu-àjà nke Jupita, nke ulo nsọ ya di n'iru obodo ahu, we sekputa ehi weta kwa okoko-osisi n'ọnu-uzọ-ama obodo, ya na ìgwè madu ahu we chọ ichu àjà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye nchụaja Zeus, nke ụlọ arụsị ya dị nso nʼihu obodo, kpụtara oke ehi wetakwa okoko osisi dị iche iche. Ya na igwe mmadụ ahụ chọrọ ịchụ aja nye ha nʼọnụ ụzọ ama ha.