Acts 14:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ọ nọkwa na-agba akaebe banyere onwe ya nꞌime ọgbọ nile, site nꞌọrụ ọma ya nile. Ọ na-enye unu mmiri ozuzo, na mkpụrụ nke ala nꞌoge ha. Ọ na-enyekwa unu nri nke na-eme ka obi na-atọ unu ụtọ.”
Igbo 2006
Otú ọ di, Ọ rapughi Onwe-ya nēnweghi ihe-àmà, ebe Ọ nēme ezi ihe, nēnye kwa unu miri-ozuzo na oge nkpuru site n'elu-igwe, nēmeju obi-unu n'ihe-ọzùzù na ọṅù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼagbanyeghị nke a ọ hapụghị ị debere onwe ya ihe ndị ga-agbara ya akaebe, site nʼọrụ ọma ya niile. Dị ka inye unu mmiri ozuzo site nʼeluigwe, na mkpụrụ nke ala nʼoge ha. Ọ na-enyekwa unu nri na-emekwa ka obi na-atọ unu ụtọ.”