Acts 14:22 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌebe ahụ ha gbara ndị kwere ekwe ume ka ha na-eto eto nꞌịhụnanya nꞌebe Chineke na mmadụ ibe ha nọ. Ha kasịkwara ha obi sị ha jidesie eziokwu ahụ ike, na-agụghị nsogbu nile a na-esogbu ha. Ha mekwara ka ndị kwere ekwe mata na ha aghaghị ịba nꞌalaeze Chineke site nꞌime nsogbu dị iche iche.
Igbo 2006
nēme ka nkpuru-obi ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike, nāriọ ha ka ha nọgide n'okwukwe-ayi, nēgosi kwa na ayi aghaghi isite n'ọtutu nkpab͕u ba n'ala-eze Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼebe ahụ ha gbara ndị na-eso ụzọ ume kasịekwa ha obi sị ha jidesie okwukwe ahụ ike. Ha sịrị, “Anyị ga-agabiga ọtụtụ mkpagbu dị iche iche tupu anyị abaa nʼalaeze Chineke.”