Acts 14:26 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ha jezuru ebe ndị a nile, ha sooro ụgbọ mmiri jeruo Antiọk. Ọ bụkwa nꞌAntiọk ka ha malitere ije ha nile. Ọ bụ nꞌAntiọk ka e nyefere ha nꞌaka Chineke nꞌihi ije ozi ndị a. Ugbu a ha ejezuokwla ozi ha.
Igbo 2006
ha we si n'ebe ahu ba n'ub͕ọ je Antiọk, nke esitereri na ya rara ha nye n'amara nke Chineke ilu ọlu nke ha luzuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Site nʼebe ahụ, ha sooro ụgbọ mmiri jeruo Antiọk bụ ebe a nọ nyefee ha nʼamara Chineke nʼihi ọrụ ndị a ha rụzuru.