Acts 15:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Pọl na Banabas nọ nꞌAntiọk e nwere ụfọdụ mmadụ sitere Judia bịa nꞌebe ahụ. Ndị a malitere izi ndị kwere ekwe na ọ dị mkpa ka ha mezuo omenala ndị Juu banyere obibi ugwu tupuu a zọpụta ha.
Igbo 2006
Madu ufọdu we si na Judia ridata we zí umu-nna nime Kraist ihe, si, Ọ buru na ebìghi unu úgwù dika ọme-n'ala nke Moses nyere si di, apughi izọputa unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụfọdụ ndị ikom sitere Judịa bịa malitere izi ụmụnna ozi, “Ọ bụrụ na e bighị unu ugwu dịka Mosis nyere nʼiwu, a pụghị ịzọpụta unu.”