Acts 15:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Pita akọọrọla unu ihe banyere otu Chineke si leta ndị mba ọzọ. Chineke sitere nꞌetiti ha họpụtara onwe ya ndị ga-asọpụrụ ya, na ndị ga-ebuli aha ya elu.
Igbo 2006
Simeon kọrọ otú Chineke buru uzọ leta ndi mba ọzọ, isi n'etiti ha weputara aha-Ya otù ndi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Saimọn akọọlara anyị otu Chineke si buru ụzọ lekọta ndị mba ọzọ site na isite nʼetiti ha họpụtara onwe ya ndị ga-ekwere na aha ya.