Acts 15:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
‘Mgbe ihe ndị a gasịrị, dị ka Onyenwe anyị kwuru, aga m alọghachikwute ndị m. Aga m ewughachikwa ụlọ Devidi; ebe ya nile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa.
Igbo 2006
Mb͕e ihe ndia gasiri M'gālaghchi, M'gāma kwa ulo-ikwū nke Devid ọzọ, nke daworo ada; Ọ bu kwa ebe-ya nile akwaturu akwatu ka M'gēwu ọzọ, M'gēme kwa ka o guzozie ọzọ:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Mgbe nke a gasịrị, aga m alọghachi, aga m ewughachikwa ụlọ ikwu Devid nke dara ada. Ebe ya niile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa, aga m emekwa ka ọ guzozie,