Acts 15:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị nkuzi a na Pọl na Banabas rụrịtara ụka nke ukwuu. Emesịa, ndị kwere ekwe nọ nꞌAntiọk kpebiri iziga Pọl na Banabas Jerusalem ka ha gaa chọpụta ihe banyere okwu a. Ụmụnna ndị ọzọ sokwa ha gaa ịhụ ndị ozi na ndị okenye nzukọ dị na Jerusalem banyere okwu ahụ.
Igbo 2006
Ma mb͕e nkewa na ajuju nādighi ntà diri Pọl na Banabas imegide ha, ndi Kraist we dozie ka Pọl na Banabas, na ufọdu ndi ọzọ n'etiti ha, rigoro Jerusalem jekuru ndi-ozi na ndi-okenye bayere ajuju a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha na Pọl na Banabas rụrịtara ụka nke ukwuu. Nʼihi nke a, ha kpebiri ka Pọl na Banabas, na ụfọdụ ndịisi ndị ọzọ soro gaa Jerusalem hụ ndị ozi na ndị okenye nke nzukọ maka okwu a.