Acts 15:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Kama o kwesịrị ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri anụ ọ bụla e ji chụọra arụsị aja. Ka ha wezụgakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, ma ọ bụ ọbara.
Igbo 2006
kama ka ayi zigara ha akwukwọ-ozi, ka ha rapu ihe ruru árú nke arusi nile, na ikwa-iko, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ọbara.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
kama o kwesiri ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri nri ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja. Ka ha wezugakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara.