Acts 15:22 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ ndị ozi na ndị okenye na igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ fere nza iji ya ịchọpụta ndị ga-ewere okwu ahụ jekwuru ndị kwere ekwe nọ nꞌAntiọk. Ndị dị otu a ga-eso Pọl na Banabas gaa kọwaara ha ihe nzukọ a kpebiri. Ndị a họpụtara bụ mmadụ abụọ site nꞌetiti ndị isi. Ha bụ Judas onye aha ya bụkwa Basabas, na otu onye ọzọ a na-akpọ Saịlas.
Igbo 2006
Mb͕e ahu ọ di ndi-ozi na ndi-okenye nma, ha na nzukọ Kraist dum, irọputa ndikom ufọdu nime ha, na iziga ha n'Antiọk, ha na Pọl na Banabas; bú Judas anākpọ Basabas, na Sailas, ndikom bu ndi-isi n'etiti umu-nna nime Kraist:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye, ha na nzukọ niile, kpebiri ka a họpụta ndị ikom a ga-eziga Antiọk ha na Pọl na Banabas. Ha họpụtara Judas onye a na-akpọkwa Basabas, na Saịlas, ndị ndu so nʼetiti ụmụnna.