Acts 15:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nke a bụ ihe ha dere nꞌakwụkwọ ahụ ha ga-eji gaa ozi a. “Akwụkwọ a sitere nꞌaka ndị ozi, ndị okenye na ụmụnna nọ na Jerusalem. A na-edetara ya unu ndị sitere na mba ọzọ kwere na Kraịst, unu ndị nọ nꞌAntiọk, na Siria na Silisia. Anyị na-ekele unu ekele nꞌime Onyenwe anyị.
Igbo 2006
ha site-kwa-ra n'aka-ha de akwukwọ, si, Ndi-ozi na umu-nna-unu, bú ndi-okenye, nēdegara umu-nna-ayi akwukwọ, bú ndi sitere na ndi mba ọzọ, ndi bi n'Antiọk na Siria na Silisia, ayi nēkele unu:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha nyekwara ha nʼakwụkwọ ozi dị otu a, Akwụkwọ a sitere nʼaka ndị ozi, na ndị okenye ndị bụ ụmụnna unu. A na-edetara ya unu ndị sitere na mba ọzọ kwere bụ ndị nọ nʼAntiọk, Siria na Silisia. Ekele.