Acts 15:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe nzukọ Kraist dị nꞌobodo ahụ dupụrụ ha, Pọl na Banabas, na ndị so ha chere ihu ha ịga Jerusalem. Ma mgbe ha na-aga, ha kwụsịkwara nꞌobodo nta dị iche iche, nke dị nꞌụzọ ahụ, bụ obodo ndị Fonisia na Sameria. Ha na-eleta ndị kwere ekwe nọ nꞌebe ahụ, na-akọwara ha otu ndị mba ọzọ si anabata Kraịst. Nke a mere ka ndị kwere ekwe ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu.
Igbo 2006
Ya mere, mb͕e nzukọ Kraist dupusiri ha n'ije-ha, ha gabigara n'etiti Finisia, gabiga kwa n'etiti Sameria, nākọ nchighari nke ndi mba ọzọ: ha nēme kwa ka oké ọṅù diri umu-nna nime Kraist nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nzukọ ahụ zipụrụ ha nʼụzọ ha, mgbe ha sitere Fonisia na Sameria na-agafe, ha kọrọ otu ndị mba ọzọ siri chegharịa. Nke a wetara ndị niile kwere ekwe oke ọṅụ dị ukwuu.