Acts 15:36 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, Pọl gwara Banabas sị, “Ka anyị laghachikwa obodo Tọki ileta nzukọ Kraịst dị iche iche dị nꞌakụkụ obodo ahụ. Ka anyị gaa leta ndị ahụ anyị zisaara ozi ọma nꞌoge gara aga, ịmata ihe banyere ọnọdụ ndị kwere ekwe nọ nꞌebe ahụ.”
Igbo 2006
Mb͕e ubọchi ufọdu gasiri Pọl we si Banabas, Ka ayi jeghachi ub͕u a leta umu-nna-ayi n'obodo nile n'otù n'otù ebe ayi kwusara okwu Onye-nwe-ayi, ka ayi we le otú ha nēme.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Pọl gwara Banabas, “Ka anyị gaghachi nʼobodo niile anyị kwusara okwu Onyenwe anyị nʼotu nʼotu, mata ka ndị kwere ekwe si agbalị nʼebe ahụ.”