Acts 15:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ha bịaruru Jerusalem, ha zutere ndị isi ụlọ nzukọ Kraịst. Ndị ozi Kraịst nile na ndị okenye ụlọ nzukọ ahụ zukọtara nꞌotu ebe ịnụrụ ihe Pọl na Banabas nwere ikwu banyere ihe Onyenwe anyị rụrụ site nꞌaka ha.
Igbo 2006
Mb͕e ha ruru Jerusalem, nzukọ Kraist na ndi-ozi na ndi-okenye we nara ha nke-ọma, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha bịaruru Jerusalem, nzukọ, ndị ozi na ndị okenye nabatara ha, ha kọkwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee.