Acts 16:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌụbọchị izuike, anyị sitere nꞌobodo ahụ gaa nꞌakụkụ osimiri ebe anyị chọpụtara na ụfọdụ mmadụ na-ezukọ ikpe ekpere. Nꞌebe a ka anyị nọ kụziere ọtụtụ ụmụ nwanyị bịara ikpe ekpere okwu Chineke.
Igbo 2006
N'ubọchi-izu-ike ayi we pua n'ọnu-uzọ-ama obodo ga n'usọ otù osimiri, ebe ayi chère na ebe ekpere di; ayi we nọdu ala, we gwa ndinyom ndi b͕akọrọ okwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụbọchị izuike, anyị sitere nʼobodo ahụ gaa nʼakụkụ osimiri ebe anyị chọpụtara na ụlọ ekpere dị. Nʼebe a ka anyị nọ gwa ụmụ nwanyị ndị gbakọrọnụ okwu.