Acts 16:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Aha otu nꞌime ndị inyom a bụ Lidia. Ọ bụ onye na-azụ ahịa akwa e sijiri odo odo. Amụrụ ya nꞌobodo Tiatira. Ọ bụkwa nwanyị na-asọpụrụ Chineke. Mgbe ọ nọ na-ege ntị nꞌihe Pọl na-ekwu, Chineke meghere obi ya, mee ka ọ nabata okwu nile Pọl kwuru.
Igbo 2006
Otù nwanyi we nu okwu-ayi, aha-ya bu Lidia, onye nēre ihe eji esiji ákwà ododo, onye obodo Tayataira, onye nātu egwu Chineke: Onye-nwe-ayi we meghe obi-ya, iṅa nti n'ihe nile Pọl nēkwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aha otu nʼime ndị inyom nụrụ okwu anyị bụ Lidia, onye obodo Tiatira, onye na-azụ ahịa akwa e sijiri odo odo. Ọ bụkwa nwanyị na-asọpụrụ Chineke. Onyenwe anyị meghere obi ya, ige ntị nʼihe Pọl na-ekwu.