Acts 16:26 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Na mberede, ala ọma jijiji bidoro, ntọ ala ụlọ mkpọro ahụ gharịpụrụ nꞌọnọdụ ya. Ọnụ ụzọ ya nile meghekwara. Mkpọrọ igwe nile e ji kee ndị mkpọrọ dapụsịrị site nꞌebe e kegidere ha!
Igbo 2006
na mberede oké ala-ọma-jijiji di, nke mere ka ntọ-ala ulo-nkpọrọ ma jijiji: ngwa ngwa ọnu-uzọ nile we meghe; ab͕u ndi-nkpọrọ nile tọpu-kwa-ra.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Na mberede, oke ala ọma jijiji bidoro, nke mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwangwa, ọnụ ụzọ ya niile meghere, ụdọ igwe niile e jiri kee ndị mkpọrọ tọpụkwara.