Acts 16:27 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ, onyeisi nche ụlọ mkpọrọ ahụ tetara nꞌụra. Ọ hụrụ na ọnụ ụzọ nile ghere oghe. Nꞌihi ya o chere na mmadụ nile agbapụla. Ya mere, ọ mịpụtara mma agha ya chọọ igbu onwe ya.
Igbo 2006
Onye-nche ulo-nkpọrọ, ebe emere ka ọ teta n'ura, ebe ọ hu-kwa-ra ọnu-uzọ ulo-nkpọrọ ka ha megheworo, o we miputa mma-agha-ya, gaje ib͕u onwe-ya, ebe ọ nēchè na ndi-nkpọrọ ab͕apuwori.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe onyeisi nche ụlọ mkpọrọ tetara nʼụra ma hụ na ọnụ ụzọ niile ghere oghe. Nʼihi ya, o chere na ndị mkpọrọ niile agbapụla. Ya mere, ọ mịpụtara mma agha ya chọọ igbu onwe ya.