Acts 16:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi nke a Pọl rịọrọ ka Timoti soro ya nꞌije ya. Ma nꞌihi ndị Juu bi nꞌakụkụ ahụ, Pọl biri Timoti ugwu tupu o soro ha. Nꞌihi na mmadụ nile maara na nna Timoti bụ onye Griik.
Igbo 2006
Nwoke a ka Pọl chọrọ ka o so ya pua; o we were ya bì ya úgwù n'ihi ndi-Ju ndi nọ n'ebe ahu: n'ihi na ha nile matara na nna-ya bu onye-Grik.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Pọl chọrọ ka Timoti soro ya nʼije ya. Ma nʼihi ndị Juu bi nʼakụkụ ebe ahụ, o biri ya ugwu nʼihi na mmadụ niile maara na nna ya bụ onye Griik.