Acts 16:37 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Pọl zara sị, “Mbaa! Nke a abụghị ihe ha kwesịrị ime! Ha tiri anyị ihe nꞌihu mmadụ nile na-ebughị ụzọ kpee anyị ikpe. Emesịa ha tinyere anyị nꞌụlọ mkpọrọ. Anyị bụ diala nꞌobodo Rom! Olee otu ha ga-esi zipụ anyị na nzuzo. O kwesịri ka ha bịa nꞌonwe ha kpọpụta anyị!”
Igbo 2006
Ma Pọl siri ha, Ha piara ayi ihe n'iru ọra madu, nāmaghi ayi ikpé, ọ bu ezie na ayi bu ndi Rom, ha we tubà ayi n'ulo-nkpọrọ; hà nāchupu kwa ayi ub͕u a na nzuzo? ha agaghi-eme ya ma-ọli; kama ka ha onwe-ha bia duputa ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Pọl sịrị ha, “Ha tiri anyị ihe nʼihu mmadụ niile na-ebughị ụzọ kpee anyị ikpe. Emesịa ha tinyere anyị nʼụlọ mkpọrọ. Anyị bụ diala nʼobodo Rom! Olee otu ha ga-esi zipụ anyị na nzuzo. O kwesiri ka ha bịa nʼonwe ha kpọpụta anyị.”