Acts 17:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ndị bi na Beria jiri obi ghere oghe nabata okwu Chineke karịa ndị bi na Tesalonaịka. Mgbe ha gere ntị nꞌokwu Chineke, ha jiri ọṅụ nyochaa akwụkwọ nsọ ịchọpụta ma ozizi Pọl na Sailas na-ezi ọ bụ eziokwu. Ha mere nke a ụbọchị nile.
Igbo 2006
Ma ndia ka ndi bi na Tesalọnaika nma n'obi, ebe ha were obi di ọku nile nara okwu ahu nke-ọma, nēnyocha ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ kwa-ubọchi, ma ihe ndia di otú a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ndị bi na Beria jiri obi ghere oghe nabata okwu a karịa ndị bi na Tesalonaịka. Nʼihi na ha ji ịnụ ọkụ nʼobi nara okwu ahụ, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị, ka ha mara ma ihe ha na-ekwu ọ bụ eziokwu. Ha mere nke a ụbọchị niile.