Acts 17:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Pọl nọdụrụ nꞌAtens chere Timoti na Sailas. Nꞌoge a o wutere ya nke ukwuu nꞌihi arụsị nile ọ hụrụ, nke jupụtara nꞌobodo ahụ.
Igbo 2006
Ma mb͕e Pọl nēche ha n'Atens, oké iwe nēwe mọ-ya nime ya, mb͕e ọ huru ka obodo ahu juputara n'arusi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Pọl nọ na-echere ha nʼAtens, o wutere mmụọ ya nke ukwuu nʼihi arụsị niile ọ hụrụ, nke jupụtara nʼobodo ahụ.