Acts 17:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
O sokwaara ndị ọkachamara obodo ahụ, ndị a na-akpọ ndị Epikuri na ndị Stoik kwurita okwu. Kama ha enweghị afọ ojuju mgbe Pọl gwara ha ihe banyere Jisọs na mbilite nꞌọnwụ ya. Mgbe ha nụrụ ya ụfọdụ sịrị, “Nwoke a na-arọ nrọ.” Ndị ọzọ sịkwa, “Ọ na-ewebata ozizi ọhụrụ dị iche.”
Igbo 2006
Ufọdu kwa nime ndi-Epikurean na ndi-Stoik, bú ndi nāhu amam-ihe n'anya, we zute ya. Ufọdu we si, Gini ka onye-ekwukwu a nāchọ ikwu? ndi ọzọ nāsi kwa, Ọ di ka onye nēkwusa ndi-mọ nke ala ọzọ: n'ihi na ọ nēzisa ozi ọma nke Jisus na nbilite-n'ọnwu-Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya na ụfọdụ ndị Epikuri na ndị Stoịk bụ ndị ọkachamara na-arụrịta ụka. Ndị ụfọdụ na-asị, “gịnị ka onye ekwurekwu a ga-ekwu?” Ndị ọzọ sịrị, “ọ dịka onye na-ekwusa ụmụ mmụọ ndị ala ọzọ.” Ha kwuru nke a nʼihi na ọ na-ekwusa oziọma banyere Jisọs na mbilite nʼọnwụ ya.