Acts 17:23 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na mgbe m na-ejegharị nꞌobodo unu, ahụrụ m ụlọ chi dị iche iche. Otu nꞌime ha ka e dekwasịrị ihe dị otu a nꞌelu ya, ‘E wuru ụlọ a nye chi ahụ a na-amaghị.’ Nke a pụtara na unu na-efe chi ahụ unu na-amaghị ofufe. Ma ugbu a, achọrọ m ka m kọwaara unu ihe banyere ya.
Igbo 2006
N'ihi na mb͕e m'nāgabiga, nēkiri kwa ihe di iche iche unu nāsọpuru, m'we hu otù ebe-ichu-àjà nke edekwasiri ihe a n'elu ya, ENYERE CHI NKE ANĀMAGHI AMA. Ya mere ihe unu nāsọpuru nāmaghi ama, nka ka mu onwem nēkwusara unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na mgbe m na-ejegharị nʼobodo unu, ahụrụ m ụlọ chi dị iche iche, ahụrụ m otu ebe ịchụ aja nke e dekwasịrị nʼelu ya: Ihe e nyere chi nke amaghị ama. Ya mere, ihe ahụ unu na-efe ofufe nʼamaghị ama nke a ka m na-ekwusara unu.